NNYỌCHA ỌDỊBENDỊ ỊGBA ỌKỊKA EZEMEWI EZEDUGA NA NNEWI DỊ NA NNEWI NORTH, N’ ANAMBRA STATE

Priscilla Ebere Ugwuoke, PhD, Augustina Ngozi Eze, PhD, Adam Fadila Nwadimkpa Idoko

Abstract


Nchọcha a, e lebara anya n’ihe bụ Ịgba Ọkịka Ezemewi Ezeduga. Emume Ịgba Ọkịka Ezemewi Ezeduga bụ emume a na-eme na mbido afọ, ọ bụ n’ọnwa nke abụọ n’ime afọ obụla ka e ji eme emume a. Ọ bụ emume e ji asọpụrụ Chi Ezemewi Ezeduga nke Nnewi.Ịgba ọkịka bụ otu n’ime emume mbụ nke ọdịnaala nakwa nke Ọdịbandị ndị Nnewi nke ha na-eme iji wee kelee ma kpere Ezemewi maka ntuzi aka n’arọ obụla. Ezemewi Ezeduga bụ Chi ndị Nnewi nke ha kwenyere na ọ bịara n’ụdị mmadụ. Mbunuuche nchọcha a bụ ịmata ihe gbasara emume a bụ Ịgba Ọkịka Ezemewi Ezeduga, usoro etu esi eme ya bụ emume, mgbe e ji eme ya, na uru Ọ bara ndị na emeya. A kọwakwara okwu ụfọdụ gbara ọkpụrụkpụ gbasara emume a dịka; Omenaala, Ewumewu, Ọdịnaala, Ọdịbendị, Okpukperechi na Ịgba ọkịka. Atụtụ nchọcha a gbasoro bụ atụtụ ndinaọrụ. Ndị nchọcha gara n’ ọhịa nchọcha, gbaa ajụjụ ọnụ  na Ezemewi Ezeduga. Otụtụ ndị a gbara ajụjụ bụ ndị  Okenye ndị dị bido n’ afo ịrị anọ rue na ịrị asaa. Ndị bụ ndị mara ihe ekwe na-akụ gbasara emume a ma bụrụkwa ndị nwere mmasi maka ịza aziza nke ndị nchọcha chọrọ n’ aka ha. Ha weputara onwe ma kwado ndị nchọcha mgbe onye nchọcha kọwara n’ ebu n’ obi ya bụ maka Usoro agụmakwụkwọ na nkwalite omenaala ndị. Ndị nchọcha choputara ka emume a siri bido, ihe mere ndị Nnewi jiri wee na-eme ya bụ emume naakwa ihe mere ha jiri were Ezemewi Ezeduga dịka Chi ha. Nchọcha a gọsikwara ihe ndị ụfọdu a na-eme ụbọchị ya bụ emume. Ịgba Ọkịka Ezemewi Ezeduga. Nchọcha a gosiri na emume a bụ ọdịnaala ma na egosịkwa okpukperechi. N’ikpeazụ ndị nchọcha a chọpụtara na emume a adịghịzị ka ọdị mgbe gbo maka ihe ọlọrọọhụrụ. Mana a kana eme ya bụ emume ịgba ọkịka nke ọma na akwanyere Ezemewi Ezeduga ugwu maka ihe niile o mere ndị Nnewi ka a dị n’ ala ana ahụ ha anya.


Keywords


NNYỌCHA, ỌDỊBENDỊ, ỊGBA ỌKỊKA, EZEMEWI EZEDUGA, NNEWI.

Full Text:

PDF

References


Ajogwu, P. U. (2022). Omenaala Igbo: Ọdịdị nka na uru ịgọ ọjị. Arụmarụ B. A., Ngalaba Lingwistiks, Igbo na Asụsụ ndị Ọzọ, Mahadum Naịjirịa, Nsụka.

Akaeze, C. M, Aboh, S. C. & Ugwuoke, P. E. (2021). Ntọala ọdịnịịgha Igbo ọlọrọọhụrụ. Obosi: Pacific Publishers Ltd.

Anozie, C. C. (2003). Igbo kwenu (Akụkọ na omenaala Igbo). Enugu: Computer Edge Publisher.

Ezesinachi J. N., Ihedigbo, R. E. & Okey Agbo, J. N. (2023). Ọnọdụ egwu n'izipụta nkamma n'etimmmọnwụ Oji ọnụ n'Okpuje Asadu. Icheke Journal of the Faculty of Humanities, 21 (2), 1–13

Ifeka R. O. (2019). Ngwa ofufe ndị Igbo: Nzipụta ya n’agụmagụ ụfọdụ ndị a họọrọ. Preorcjah, 4(2), 62–88.

Ocho, L.O. (1998). Philosophical and Sociological Foundation of Education. Enugu: Macmillan.

Okoro, M. N. (2022). Reappraising the Nsukka Ọmabe festival through the lens of ethno-aesthetics, therapy and healing. Journal of Theological Studies, 78(1), 65–101.

Onukwube, A. (2013). Omenala: Eziokwu na Ndụ Ndị Igbo. Description of how cultural beliefs are transmitted orally and documented, highlighting their relevance in contemporary life. Enugu: Nolix Educational Publication.

Nworgu, B. G. (1991). Educational Research: Basic Issues & Methodology. Ibadan: Wisdom Publishers.

Malinowski, B. (1954). The structure and Function of Primitive Society. Charleston: Biblio Bazaar.

Anozie, C. C. (2003). Akụkọ na Omenaala ndị Igbo. Enugu: Computer Edge Publishers.

Ugwuoke, P. E. (2023). Nyocha Nka Odimara Echichi Onyeishi N’ ovoko-Akpụrụokwe site N’ atụtụ nabamuru. Odezuruigbo: An international Journal of Igbo, African and Asian Studies, 7(2). https://Nigerian journal online.com/index.Php/ODEZURUIGBO/Issue/View/472. ISSN: 2672-4243. Print

Creswell, J. W. (2020). Researcg Design: Qualitative and Quantitative Approaches. Thousand Oaks: Sage Publications.


Refbacks

  • There are currently no refbacks.


Copyright (c) 2025 Priscilla Ebere Ugwuoke, PhD, Augustina Ngozi Eze, PhD, Adam Fadila Nwadimkpa Idoko

Creative Commons License
This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial 4.0 International License.

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 ISSN (Print):   2695-2319

ISSN (Online): 2695-2327

 

 

   

 

Creative Commons License
This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial 4.0 International License.