ITULE NA IKUZI OMENAALA ALỤMALỤ NDỊ IGBO SITE N’AGỤMAGỤ UDO KA MMA N’OGOSEKỌNDỊRỊ NTA

Priscilla Ebere Ugwuoke, Roseline Ifeoma Eze, Chioma M. Akaeze

Abstract


Nchọcha a lebra anya n’ịchọpụta na ikụzi usoro alụmalụ dị iche iche ndị Igbo na-agbaso dị n’ akwụkwọ agụmagụ ederede, Udo ka mma nke A. B.Chukuezi drere. Nchọcha kọwara ma kuzie usoro alụmalụ nke ndị Igbo pụtara ihe n’ejije, Udo ka mma. Nchọcha a lebara anya na mkpa ọ dị na ndị ntorobịa ga-agbaso usoro omenaala ndị Igbo na etu kwesiri ekwesi ndị Igbo si alụ dị na nwunye n’ala Igbo. Nchocha a jiri atụtụ nkọwamị were kọpụta mbunuche ya ma gbadokwa ụkwụ n’ atụtụ mbunuche ọgụụ wee tụcha isiokwu nke ha wepụtara bụ etu e si alụ dị na nwunye n’ala Igbo. E sitere n’ịgụ ihe ndị e derela metụtara isi okwu anyị wee nwete isiokwu a gbadoro ụkwụ e ji mee nchọcha a.  Nke a nyere ndị nchọcha aka ịchọpụta ihe ndị dị mkpa na ihe ha na-ekwu maka ya. Atụtụ njirime nchọcha nke Sigmund Freud (1965) bụ nke a kpọrọ atụtụ mbunuche (psychological theory of criticism) bụ nke ndị nchọcha gbasoro wee tụcha agụmagụ e ji mee ihe ọmụmụ a. Ndị nchọcha chọpụtara na alụmalụ bụ nnukwu omenaala Igbo ma bụrụkwa ihe zuru ụwa ọnụ. Nchọcha ha gosiri na ọ bụ nwoke na-alụ nwaanyị n’ala Igbo, na ọ bụghị nwaanyị na-alụ nwoke. Nchọpụta ọzọ gosiri na ihe e ji alụ dị na nwunye n’ala Igbo bụ maka iwube ezinaụlọ nwere ugwu na nsọpụrụ.Ugwu na nsọpụrụ ezinụlọ ndị abụ site na nzube ụmụnna. A chọpụtakwara na alụmalụ n’ala Igbo kacha dịrị ndị okenye na ụmụnna n’aka karịa ndị ahụ chọrọ ịlụ onwe ha. N’ịkpaazụ ndị nchọcha nyere arọ ka ndị nne, ndị nna na ụmụnna na-akwado ndị ntorobịa k h na-agbaso usoro alụmalụ dị n’ala Igbo. Nke a ga-adị ire site n’ezigbo nkwado nke izugbe ụmụnna ebe a na alụ dị na nwunye. Ọ ga eme ka omenaala Igbo na-etowanye n’ugwu na nsọpụrụ.

Keywords


Omenaala Igbo, usoro alụmalụ, agụmagụ, ejije.

Full Text:

PDF

References


Agbo, D..J.U. (1993). Igbo Traditional Religion: The Spriituality and the eschatological character of Igbo traditional charity (vol.2). Nsukka: Chinedu Press.

Chukuezi, A.B (1997). Udo ka Mma Ibadan: Oxford University Press.

Emelia, I.I (1977). Critical appreciation of Enyinna Akọma’s Obidiya, B.A thesis in Department of Linguisticis, Igbo and other Nigerian Language University of Nigeria Nsukka.

Eze, R. I. (2019). Mmụta asụsụ Igbo n’ogo sekọndirị Junịọ. Chuka Educational Publishers. Nsukka, Chuka publishers ISBN: 978-978-56751-8-4

Eze, R.I. na Umo C. (2017). Ụtọasụsụ na Omenala Igbo maka Sekọndịrị Senịọ WAEC na NECO, Merit International Publication. ISBN 978-978-52902-6-4 .

Ezeuko, R.O (1998). Ewumewu, Omenaala Ofufe na nkwenye ndị Igbo. Nkpor: MAS Founders Publication Ltd.

Heugh,K.(2007) Language and Literary issues in South Africa.In N.Rassool.Global Issues in language education issues and development: perspectives from postcolonial language:Clevedon Multilingual Matters,pp.187-217.

Hornby, A.S (2010) Oxford Advanced Learners Dictionary Ibadan: Oxford University Press.

Ijem, J.N. (2019). Nyocha Agwa na Akparamagwa n’ejije Udo ka Mma nke A.B Chukuezi dere B.A Project Nsukka: University of Nigeria.

Ikeokwu, E.S and Onyejekwe, M.C. (2004). Mmalite Ọmụmmụ na Nghọta Ejije Igbo Ọdịnaala na ọdọrohụụ. Enugu: CID JAP Press.

Obi N.M (2006). Language, tool for literature in O.M Ndịmele (eds), Four decades in the study of language and linguistics in Nigeria, National Institute for Nigeria Language (Pg 60 – 92).

Okebalama, C. N. (2003). Agụmagụ Ọnụ Igbo. Enugu: Snap Press Limited.

Robin, M. (1965). Understanding literature. Cambridge: Cambridge University Press.

Tyson, L. (2006) Critical theory today, a user- friendly guide. New York: Routledge.

Ugwuoke P.E,Ikeokwu,E.S & Agbedo, C.U(2019).Drama and Theatre veritable instruments for Societal Development in Nsukka Working Papersin Language, Linguistics, and Literature (NW PLLL). Vol 7 (21 – 35).


Refbacks

  • There are currently no refbacks.


Copyright (c) 2021 Priscilla Ebere Ugwuoke, Roseline Ifeoma Eze, Chioma M. Akaeze

Creative Commons License
This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial 4.0 International License.

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 ISSN (Print):   2695-2319

ISSN (Online): 2695-2327

 

 

   

 

Creative Commons License
This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial 4.0 International License.