NGỤ N’ASỤSỤ IGBO

Anthony Ebelechukwu Egbuna, Florence Uju Ibeh

Abstract


Nchọcha a lebara anya na ngụ n’asụsụ Igbo. A bịa n’ihe gbasara ọmụmụ ụtọasụsụ e nwere katigori mkpụrụokwu na katigori nghọtaokwu. Ngụ bụ otu n’ime katigori nghọtaokwu e nwere n’ụtọasụsụ Igbo nke na-adabere na mkpọaha na kwa ngwaa were arụ ọrụ izipụta nghọta. Ngụ n’asụsụ Igbo bụ ụzọ e si akọwa ole ihe a na-ekwu maka ya dị. O nwere ike ịbụ mkpọolu maọbụ ụbara. Mkpọolu pụtara otu ihe ebe ụbara pụtara na ihe a na-ekwu maka ya karịrị otu ihe. Asụsụ Igbo nwere ọtụtụ ụzọ dịwaga iche o si ezipụta ngụ. ụfọdụ ndị ọkammụta asụsụ Igbo kwuru na ngụ abụghị katịgorị n’ụtọasụsụ Igbo. Nke a na-ebute ọtụtụ nsogbu na ihe mgbagwoju anya n’ebe ndị na-amụ na ndị na-akụzi asụsụ Igbo nọ. Nke a kpalitere ime nchọcha n’isiokwu a. Ebumnobi nchọcha a bụ ịkọwa ngụ, ịchọpụta ụzọ dị iche iche asụsụ Igbo si ezipụta ngụ ya na ịkọwapụta katigori mkpụrụokwu e ji ezipọta ngụ. A gbasoro usoro nkọwa wee mee nchọcha a. Atụtụ nchọcha bụ nke ndoko okwu. Nchọcha a gbadoro ụkwụ naanị n’asụsụ Igbo n’ihe gbasara izipụta ngụ ya. A gara n’ọba akwụkwọ dị iche iche ma gụọ ọtụtụ akwụkwọ metụtara isiokwu a. Ndị nchọcha bụkwa ndị Igbo, toro ma gụọ akwụkwọ ha niile n’ala Igbo, nke a nyekwara aka nke ukwu. A chọpụtara na ngụ bụ katịgori nghọta okwu n’asụsụ Igbo. A chọpụtara na ngụ na-arụ ọrụ n’ime katigori mkpụrụokwu dị ka aha, nnọchiaha, ọnụọgụgụ, ngwaa, mkpokọta n’asụsụ Igbo na ihe ndị ọzọ. Ndị nchọcha a ga-abara uru bụ ụmụ akwụkwọ, ndị nkụzị na kwa ndị ọzọ chọrọ ime nchọcha n’ụdị isiokwu a. 

Keywords


Asụsụ Igbo, Mgbanwe, Ngụ, Usorookwụ, Ụtọasụsụ

Full Text:

PDF

References


Agbedo, C.U. (2000). General Linguistics: An Introductory Reader. Nsukka: ACE Resources.

Corbett, G.C. (2004). Number. U.K: Cambridge University Press.

Crystal, D. (2008). A Dictionary of Linguistics and Phonetics (6th ed.) Malden: Blackwell.

Emenanjo, E.N., Okolie, O. O. & Ekwe, B. U. (1985). Igbo Maka Sinịọ Sekọndịrị I. Ibadan: University Press.

Ikekọnwụ, C. Ezikeojiakụ, P.A, Ụbani, A na Ugoji, J. (1999). Fonolọjị na Grama Igbo. Ibadan: University Press.

Lamidi, M.T. (2008). Aspects of Chomskyan Grammar. Ibadan: University press.

Lyons, J. (1968). Theoretical Linguistics. Cambridge: Cambridge University Press. Mbah, B. M. (2011). GB Syntax: A Minimalist Theory and Application to Igbo. Enugu: CLDJAP Press.

Mbah, B. M. (2014). Atụtụ Amụmamụ Igbo. Enugu: University Press.

Ngoesi, M.C. (2000). Nchịkọta ihe Ọmụmụ nke Asụsụ Igbo maka Ule Sinịọ Sekọndịrị. Nkpor: Optimal Press.

Ọgbalụ, F. C. (1985). Ọkaasụsụ Igbo. Onitsha: Varsity Press.

Okonkwo, M.N. (1974). A Complete Course in Igbo Grammar. Lagos: Macmillan.


Refbacks

  • There are currently no refbacks.


Copyright (c) 2021 Anthony Ebelechukwu Egbuna, Florence Uju Ibeh

Creative Commons License
This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial 4.0 International License.

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 ISSN (Print):   2695-2319

ISSN (Online): 2695-2327

 

 

   

 

Creative Commons License
This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial 4.0 International License.