AZỤMAHỊA NA NAỊJIRIA NA ỌNỌDỤ ASỤSỤ IGBO NA SENTURI NKE IRI ABỤỌ NA OTU

Patrick IK Umezi

Abstract


Isiokwu nchọcha a bụ Azụmahịa na Naịjiria na ọnọdụ asụsụ Igbo na senturi nke iri abụọ na otu. Ihe nwanchọcha bu n’obi bụ ịchọpụta etu azụmahịa na Naịjiria si metụta ọnọdụ asụsụ Igbo na senturi nke iri abụọ na otu. Ihe kpalitere ya ime nchọcha a bụ maka na adịmmkpa asụsụ ọbụla gbadoro ụkwụ n’adịmmkpa ndị nwe asụsụ ahụ. Atụtụ mgbakwasa isiokwu nchọcha a bụ atụtụ Ngwakọrịta usoro azụmahịa; nke a kpọrọ Marketing Mix maọbụ 4PS of marketing n’asụsụ Bekee. A bịa na Naịjiria, ndị Igbo kacha pụta ihe n’ihe gbasara azụmahịa. Ihe ọ pụtara bụ na asụsụ Igbo kwesiri ịbụ asụsụ  dị mkpa ma na-ewu ewu na Naịjiria; mana ọ dịghị etu ahụ. Nwanchọcha chọrọ ịchọpụta ihe kpatara nke a. Mgbe e mechara nchọcha a, a chọpụtara na a bịa n’azụmahịa na Naịjiria, ọ bụ ndị Igbo kacha pụta ihe na ya. Mana na n’agbanyeghi nke a asụsụ Igbo so n’asụsụ ndị na-alaghachi azụ. A chọpụtara na ihe kpatara asụsụ Igbo ji ada ada bụ na ụfọdụ ndị nne na nna ndị Igbo anaghị asụrụ ụmụ ha asụsụ Igbo n’ụlọ ha dị iche iche. Ụfọdụ narịị eziga ụmụ ha maka ịgụ akwụkwọ n’ụlọakwụkwọ anaghị amụ asụsụ Igbo. Ọzọkwa, ụfọdụ ndị nkụzi ejighi ya akụzi ihe n’ụlọakwụkwọ. Nke ka njọ bụ na ụfọdụ ụmụakwụkwọ na-anata ntaramahụhụ mgbe ọbụla ha sụrụ  asụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ. A chọpụtakwara na ọ na-eme ụfọdụ ndị Igbo ihere ịsụ asụsụ Igbo ebe ndị mmadụ nọ. N’ikpe azụ, a chọpụtara na ihe e nwere ike ime iji mee ka asụsụ Igbo dị elu bụ  na ndị Igbo kwesiri ịhụ  asụsụ Igbo n’anya ma na-asụ ya ebe ọbụla ha nọ; ndị nne na nna ga-agba mbọ hụ  na ụmụ ha na-asụ asụsụ Igbo dị ka asụsụ ire nne n’ụlọ ha dị iche iche. N’otu aka ahụ, ha ga-akwụsị iziga ụmụ ha maka agụmakwụkwọ n’ụlọakwụkwọ ndị anaghị asụ asụsụ Igbo. Ndị gọọmenti, n’aka nke ha ga-enye aka n’ịkwalite asụsụ Igbo site n’ime iwu dị iche iche ga-enye aka maka ọganihu asụsụ Igbo n’ogo agụmakwụkwọ dị iche iche. Ihe ndị a ga-enye aka n’ebe ọ dị ukwuu iji kwalite asụsụ Igbo n’ogo dị elu.

Keywords


Azụmahịa, Asụsụ, Ndị Igbo, Asụsụ Igbo, Naijiria.

Full Text:

PDF

References


Anagbogu, P.N, Mbah, B.M & Eme, C.A. (2010). Introduction to linguistics. Awka: Amaka Dreams.

Atupulazi, J. & Eleke, I. (2019). Igbo language; will ndị Igbo allow it to die?. FIDES Nwes Paper. Vol. 27 No. 2, May 19-25, pp.1-2.

Balkin, J.M. (2010). Commerce. Machigan Law Review, vol. 109 no.1 pp.1-51

Barnet, R. E. (2001). The original meaning of the commerce clause. University of Chicago Law Journal vol. 68. No. 1 pp. 101-147

Basden, G. T. (1921). Among the Ibos of Nigeria. Onitsha: University Publishing Company.

Dimebo, I.N & Nna, I.F. (2019). Akụ kụ ahụ mmadụ dị ka mbụrụ nsinuche n’asụsụ Igbo. Odezuruigbo (An international journal of Igbo African and Asian Studies) Vol.3 No.1,Pp. 1-11

Ejiọfọ, P.(2015). Ajọ ọrịa ji asụsụ Igbo: Okenye ịnọ n’ụ lọ ewu na-amụ n’ọgbịrị. Awka: Valid Publishing Company.

Elugbe, B.O. (1990). National language and national development. In Emenanjo, E.N. (Ed.) Multilingualism: Minority language and language policy in Nigeria. Agbor: Central Books Ltd.

Eme, C.A. & Nkamigbo, L.C. (2009). “Naịjiria: Asụsụ , omenala na mmepe obodo”. Akwụkwọ a gụrụ na jonal mmụta Igbo, vol.4, No.1

Essien, O. (2013). Language and Nigerian reform agenda. In Ndimele, O., Ikekeonwu, C.I. & Mbah, B.M. (Eds). Language and Economic Reform in Nigeria. Pp.1-16 Port-Harcourt: Grand Orbit Communication & Emhaị Press

Isichei, E. (1976). A history of Igbo people. New York: Macmila press ltd

Jahanshashi, A. A. & Mirzaie, A. (2011). Mobile commerce beyond electronic commerce: Issues and challenges. Asian Journal of Business and Management Sciences. Vol 1 No.2 pp. 119-129

McCarthy, J.E. (1960). Basic marketing: Amanagement approach. Homewood: Richard D. Irwin.

Ndimele, O. (2005). Globalization and the vanishing of Africa: Any glimmer of hope at this turbulent sea. In Ndimele, O. (ed). Globalization and the study of languages in Africa. Pp.65-70. Port-Harcourt: Grand Orbit Communication & Emhaị Press

Ngoesi, M.C. (2000). Nchịkọta ihe ọmụmụ nke asụsụ Igbo. Nkpor: Optimal press.

Nwadike, I. U. (2002). Igbo language in education: A historical study. Obosi: Pacific Correspondence college and Press.

Nwaozuzu, G.I. (2015). “Agbambọ ndị Igbo na nkwalite asụsụ na omenala ha.” A paper presented at the 9th Chief Dr. F.C. Ogbalu Memorial Lecture held at Nnamdị Azịkiwe University, Awka.

Odo, D.C. (2019). Elites and the decline of spoken and written Igbo, indegeneous language and culture. Odezuruigbo ( An international journal of Igbo African and Asian Studies) Vol.3 No.1, Pp. 139-151

Onwujeogwu, M.A. (1981). An Igbo civilization: Nri kingdom and hegemony. London: Ethiope Publishing Company.

Prasad,T.(2009). A course in linguistics. Nwe Delhi:PHI Wearing publishers.

Ugochukwu,C. N. (2019). Asụsụ na mmepe obodo: Ka o si metụta ala Igbo. language and culture. Odezuruigbo ( An international journal of Igbo African and Asian Studies) Vol.3 No.1, Pp. 12-23

Umeodinka, A.U. (2020).Introduction to contrastive analysis. Awka: Divine Press.

Umeodinka, A. U. & Okoye, C.I. (2018). Mmekpa ahụ ndị nne na nna na-enye asụsụ Igbo n’oge ugbu a. Odezuruigbo Journal, Vol.2 No.2

Umezi, P.I. (2020). Ọdịda ilu Igbo na senturi nke iri abụọ na otu . Enyo: Jonal otu ndị ji edemede akwalite asụsụ na omenaala Igbo. vọl.1, nọ.1, Pp.87-100.


Refbacks

  • There are currently no refbacks.


Copyright (c) 2021 Patrick IK Umezi

Creative Commons License
This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial 4.0 International License.

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 ISSN (Print):   2695-2319

ISSN (Online): 2695-2327

 

 

   

 

Creative Commons License
This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial 4.0 International License.